Ndi Igbo bu ndi e ji mgbasiike n’oru mara. Ufodu ilu Igbo ndi dika, “aka aja aja na-ebute onu mmanu mmanu, a ruo n’anwu, erie na ndo, ike kete, o rie, onye ruo, ya erie” na ndi ozo. bucha okwu na-egosi na ndi Igbo maara uru o bara mmadu igbasi ike n’oru iji ruputa ihe ha ga-eri. O bukwa onodu di otu a mere ndi Igbo jiri nwee aka oru di iche iche bukwa nke e jirila mara ha ma na-akpotukwara ha. O
... [Show full abstract] dizi mwute na otutu umuafo Igbo o kachakwa ndi ntorobia elegharala usoro aka oru ndia anya ya na ilu Igbo ndia na-akwado mgbasiike n’oru, wee bowe anya n’elu na-eche mgbe aku na uba ga-esi n’elu efeda, ufodu wee ganye aka na mpu na aghugho di iche iche, ndi na-adola, mmepe obodo azu. Nchocha a lebara anya n’ime obodo Mbieri nke di na Kansul ime obodo Mbaitoli nke steeti Imo, wee choputa na ndi dika oru iku mmanya na igbu nkwu bxzi ihe ndi a hapuru naani ndi agadi nwoke, nke o ga-abu ha nwusia, o dighikwa ndi ga-anochiche anya ha, ebe aka oru ndi ozogasi dika igwu mpochi, iwu ulo, idozi akpukpoukwu ka a hapuuru ndi obiara abia. Edemede a na-akato onodu di otu a wee na-ekwu na o buru na umu afo Igbo agbalaa azu we bute ukwa; site n’igbasowe usoro mmuta aka oru ha, onodu aku na uba ga-adi mma karia ihapuru ndi si mpaghara ugwu na mba ndi dika Ghana, ka ha rikpute n’ala Igbo jirizie aka oru ndi a ndi Igbo leghaara anya, na-ayo ego ma na-ewulitekwa aku na uba nke ala ha. Edemede a bu maka odimma umu afo Igbo niile, o kachakwa ndi ntorobia na-acho oru. O ga-eme ka onye o bula guru nchocha a chebara onwe ya echiche ma hukwa na o ga-enweriiri aka oru a ga-eji mara ya, maka odimma ya, nke ezi na ulo ya nakwa ala Igbo niile. N’edemede a, a kowara ihe bu aka oru, leba anya n’udi aka oru di iche iche ndi Igbo nwere, usoro inweta aka oru nakwa uru di n’inwe ezigbo aka oru. A chikotara ya wee kwuo na o di ezigbo mkpa nwa afo Igbo o bula inwe otu aka oru ma o bu nke ozo. A tukwara alo ma nye ntuziaka maka odimma n’odiniihu.